Luke 13:34 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ị dị nnọọ egwu gị obodo Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma na nke na-eji nkume atụgbu ndị nile Chineke zitere inyere gị aka. Lee ka m si gbalịa ịchịkọta ụmụ gị ọnụ, dị ka nne ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya nꞌokpuru nku ya, ichebe ha, ma ị chọghị.
Igbo 2006
Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nnekwu-ọkuku nāchikọ umu nke aka ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi!
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“O Jerusalem! Jerusalem! Gị onye na-egbu ndị amụma ma na-ejikwa nkume atụgbu ndị e ziteere gị. Ọtụtụ mgbe ka m gbalịrị ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ sị achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya, ma unu ekweghị.