Luke 13:35 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ugbu a ahapụrụla m gị ụlọ gị ka ọ bụrụ ihe tọgbọrọ nꞌefu. Ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ tutuu ruo mgbe i jikeere ịnabata m na ịsịkwa, ‘Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị.’ ”
Igbo 2006
Le, anārapuru unu ulo-unu: ma asim unu, Unu agaghi-ahum ma-ọli, rue mb͕e unu gāsi, Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu. Ma agwa m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ ruo mgbe oge ahụ ga-abịa, mgbe unu ga-asị, ‘Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.’ ”