Luke 13:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs kọọrọ ha akụkọ a, “Otu nwoke kụrụ osisi fiigi nꞌubi ya. Mgbe oge ruru ka osisi ahụ mịa mkpụrụ, nwoke a bịara lee ma ọ ga-enweta mkpụrụ ọ bụla, ma ọ dịghị nke ọ chọtara. Ọ bịakwara ọzọ, bịakwa ọzọ, ma o nweghị mkpụrụ ọ bụla ọ chọtara.
Igbo 2006
O we tua ilu a; Otù onye nwere osisi fig akuru n'ubi-vine-ya; o we bia nāchọ nkpuru n'elu ya, ma ọ hughi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu nwoke kụrụ osisi fiig nʼubi vaịnị ya, ma mgbe ọ bịara chọọ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla.