Luke 13:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌikpeazụ, nwoke ahụ gwara onye ọrụ ubi ya sị, ‘Gbutuo osisi fiigi a nꞌihi na ọ bakwaghị uru. Nke a emeela afọ atọ m bịara ịghọ mkpụrụ nꞌelu ya, ma o nweghị mkpụrụ ọ bụla m hụrụ. Gịnị bụ uru ọ bara ịhapụ ya, mgbe anyị nwere ike iji ala a mee ihe ọzọ dị mkpa?’
Igbo 2006
O we si onye-ọlu-vine-ya, Le, site n'arọ atọ rue ub͕u a ka m'nābia nāchọ nkpuru n'osisi fig a, ma ahughm: b͕utue ya; gini mere ọ nēme kwa ka ala la n'iyì?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ọ gwara onye ọrụ ubi ya sị, ‘Nʼime afọ atọ ndị a ka m bịara ka m ghọrọ mkpụrụ site nʼosisi fiig a, ma ahụghị m mkpụrụ ọbụla. Gbutuo ya! Gịnị mere ọ ga-eji na-erikọ nri dị nʼala ubi a?’