Luke 14:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Kama mgbe ị batara, legharịa anya, nọdụ nꞌoche dị ala. Mgbe onye kpọrọ gị oriri bịara hụ gị, ọ ga-asị gị, ‘Enyi m, bịa nọdụ nꞌoche a dị mkpa e debeere gị.’ Nꞌoge ahụ ị ga-enwe ugwu nꞌanya ndị ọzọ a kpọrọ oriri ahụ.
Igbo 2006
Ma mb͕e ọ bula agākpọ gi, ga nọdu n'ọnọdu ikpe-azu; ka, mb͕e onye kpọworo gi gābia, ka o we si gi, Eyìm, rigo n'ọnọdu ka elu: mb͕e ahu i gēnwe otuto n'iru ndi nile gi na ha nānọdu na nri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe a kpọrọ gị, nọdụ nʼoche dị ala, ka ọ ga-abụ na onye kpọrọ gị oriri bịa, ọ ga-asị gị ‘Enyi m, rigota nʼebe a ka elu.’ Mgbe ahụ, ị ga-enwekwa ugwu nʼanya ndị niile a kpọrọ gị na ha oriri.