Luke 14:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs gwakwara onye ahụ kpọrọ ya oriri ahụ sị, “Mgbe ọ bụla ị chọrọ ịkpọ oriri, akpọla nanị ndị enyi gị na ụmụnne gị na ndị ikwu gị na ndị ọgaranya, nꞌihi na ọ bụrụ na ọ bụ ụdị ndị a nanị ka ị kpọrọ, ha ga-akpọkwa gị nꞌoge nke ha.
Igbo 2006
O we si kwa onye kpọrọ Ya-ri, Mb͕e ọ bula i siri nri-ututu ma-ọbu nri-anyasi, akpọla ndi-eyì-gi, ma-ọbu umu-nne-gi, ma-ọbu ndi-ikwu-gi, ma-ọbu ndi-ab͕ata-obi-gi, bú ndi ọgaranya; ka ha onwe-ha we ghara ikpọghachi kwa gi ma eleghi anya, ewe nyeghachi gi ihe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gwara onye ahụ kpọrọ ya oriri sị, “Mgbe ị na-akpọ oriri nke nri ehihie maọbụ nke nri anyasị, akpọla naanị ndị enyi gị maọbụ ụmụnne gị ndị nwoke maọbụ ndị ikwu na ibe gị, maọbụ ndị agbataobi gị bara ọgaranya, nʼihi ma eleghị anya, ha pụrụ ịkpọkwa gị na mgbe nke ha, sị otu a kwụghachi gị ụgwọ.