Luke 14:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ndị nile a kpọrọ oriri ahụ bidoro ịsị na ha agaghị abịa. Onye nke mbụ sịrị, ‘Ọ dịbeghị anya m kwụrụ ụgwọ ala m zụrụ. Ala m aga ile ya. Biko gwara m nna gị ukwu na agaghị m abịa.’
Igbo 2006
Ma ha nile were otù olu malite iriọ ka arapu ha. Onye mbu siri ya, Azutaram ubi, ọ dikwam nkpà ipu gāle ya: ariọm gi guam n'onye riọrọ ka arapu ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma ha niile nʼotu nʼotu malitere inye ọsịsa. Onye nke mbụ sịrị, ‘Azụrụ m iberibe ala ọhụrụ, ọ dịkwa mkpa na m ga-eje hụ ya, biko gbaghara m, agaghị m abịa.’