Luke 14:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Onye e ziri ozi lọtara kọọrọ nna ya ukwu ihe ndị ahụ a kpọrọ kwuru. Iwe dị ukwuu were nwoke ahụ kpọrọ oriri ahụ. Ọ gwara onye na-ejere ya ozi sị, ‘Gaa ngwangwa nꞌokporo ụzọ ukwu na okporo ụzọ nta kpọbata ndị ogbenye nile na ndị ngwụrọ nile na ndị ụkwụ rụrụ arụ nile ị hụrụ.’ Onye ozi ahụ pụrụ kpọbatachaa ndị nile ọ hụrụ. Emesịa, ọ bịara gwa nna ha ukwu sị, ‘Nna anyị ukwu, akpọbatala m ndị nile ị sị m kpọbata, ndị ogbenye na ndị ngwụrọ na ndị ụkwụ rụrụ arụ. Ma ohere ka fọdụkwara nꞌụlọ.’
Igbo 2006
Orù ahu we bia, kọrọ onye-nwe-ya ihe ndia. Mb͕e ahu nna-nwe-ulo ahu, ebe iwe were ya, ọ si orù-ya, Pua ọsọsọ ga n'amá nile na uzọ ntà nile nke obodo, kpọbata n'ebe a ndi-ob͕eye na ndi-ọlusi na ndi-ìsì na ndi-ngwurọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ohu ahụ lọtara, kọọrọ nna ya ukwu ihe ndị ahụ a kpọrọ oriri kwuru. Mgbe ahụ, iwe dị ukwuu were nna ya ukwu, nke a mere ka o zipụ ohu ya sị ya, ‘Gaa ngwangwa nʼokporoụzọ ukwu na nʼokporoụzọ nta dị nʼobodo a, kpọbata ndị ogbenye, na ndị ụkwụ rụrụ, na ndị ìsì na ndị ngwụrọ.’