Luke 14:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ibu onye na-eso ụzọ m, onye ahụ ga-ahụ m nꞌanya karịa nna ya na nne ya na nwụnye ya na ụmụ ya, na ụmụnne ya nwanyị. Ọ ga-ahụkwa m nꞌanya karịa ndụ nke aka ya.
Igbo 2006
Ọ buru na onye ọ bula abiakutem, ma ọ kpọghi nna nke ya asì, ya na nne nke ya, na nwunye nke ya, na umu nke ya, na umu-nne-ndikom nke ya, na umu-nne-ndinyom nke ya, e, ndu nke aka ya kwa, ọ pughi ibu onye nēso uzọm.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Onye ọbụla chọrọ iso m, ma o bụghị ụzọ kpọ nne na nna ya, na nwunye ya, na ụmụ ya, na ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwanyị tinyekwara ndụ nke ya onwe ya asị, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.