Luke 14:28 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu achọọ iwu ụlọ, ọ̀ gaghị eburu ụzọ nọdụ ala gukọọ ihe ọ ga-efu ya iwu ụlọ ahụ? Ọ̀ gaghị agụkọkwa ego o nwere nꞌaka ya mata ma ọ ga-ezuru ya iwu ụlọ ahụ ma ọ bụ na ọ gaghị ezuru ya?
Igbo 2006
N'ihi na ònye nime unu, nke nāchọ íwu ulo-elu, nēbughi uzọ nọdu ala gu ego ọ gēwe, ma o nwere ego ọ gēji lusia ya?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ọ dị onye ọbụla nʼime unu chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala, gbakọọ ihe ọ ga-efu ya, iji chọpụta ma o nwekwara ego ga-ezu iwucha ya?