Luke 14:29 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na ọ bụrụ na o cheghị echiche banyere nke a, o nwere ike wuruo nanị na ntọ ala ụlọ ahụ kwụsị, chọpụta na o jizughị ego ga-ezuru ya. Mgbe ahụ ọ bụrụ na ndị mmadụ esi ebe ahụ gafee hụ na o nweghị ike iwucha ụlọ ya, ha ga-ebido ịchị ya ọchị, na-asị,
Igbo 2006
Ka ndi nile ndi nāhu ya we ghara imalite ime ya ihe-ọchì ma eleghi anya, mb͕e ọ tọsiri ntọ-ala-ya, ma o nweghi ike iwuzu ya,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ọ bụrụ na ọ tọọ ntọala ma o nwekwaghị ike wuchaa ya, onye ọbụla hụrụ ya ga-achị ya ọchị,