Luke 14:31 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ọ bụrụ na otu eze achọọ ịlụso eze ibe ya ọgụ, ọ gaghị eburu ụzọ chọpụta ma o nwere ike iji puku ndị agha iri lụso onye eze nke ọzọ ji iri puku ndị agha abụọ abịa ọgụ?
Igbo 2006
Ma-ọbu òle eze, mb͕e ọ nāga ibu agha megide eze-ibe-ya, nāgaghi-ebu uzọ nọdu ala b͕a ìzù ma ọ puru ichi orú nnù ndi-agha na nnù ise zute onye chiri ọgu nnù ndi-agha abua na nnù iri bia imegide ya?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Maọbụ olee eze chọrọ ịlụso eze ibe ya ọgụ, ọ gaghị ebu ụzọ nọdụ ala tulee ma puku ndị agha iri ya ọ ga-ezuru ya iji lụso onye ji iri puku ndị agha abụọ abịakwute ya ọgụ?