Luke 14:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla akpọọ gị oriri ọlụlụ nwụnye, abatala nọdụ nꞌoche dị mkpa, nꞌihi na ma eleghị anya, onye kpọrọ gị oriri kpọkwara ndị ọzọ dị mkpa karịa gị.
Igbo 2006
Mb͕e ọ bula madu gākpọ gi n'oriri ọlulu-nwunye, anọdula n'isi ọnọdu; ma eleghi anya ọ kpọwori otù onye ka gi na nsọpuru,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mgbe mmadụ ọbụla kpọrọ gị oriri nʼọlụlụ di na nwunye, abatala nọdụ nʼoche ndị a na-asọpụrụ, nʼihi na eleghị anya, onye kpọrọ gị oriri kpọkwara onye ka gị nwe nsọpụrụ.