Luke 15:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nwa ya nwoke nke nta bịakwutere nna ya otu ụbọchị sị ya, ‘Nna m, kenye m ugbu a, site nꞌakụ na ụba i nwere, ihe m kwesịrị iketa mgbe i nwụrụ.’ Nna ya kenyere nwa ya ahụ ihe o kwesịrị iketa.
Igbo 2006
nke bu nwata nime ha we si nna-ya, Nna, nyem òkè nke ihe i nwere nke rurum. O we kewara ha ihe nile o ji biri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nwa ya nke nta sịrị nna ya, ‘Nna, kenye m oke ruuru m nʼihe niile i nwere.’ Ya mere, o kenyere ya oke nke ya site nʼihe o nwere.