Luke 15:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, nwokorọbịa ahụ kwakọtara ihe nile o nwere hapụ ezi nna ya gaa biri nꞌotu obodo dị nnọọ anya. Nꞌebe ahụ, o mefuchara ego nile o nwere na ndụ ọjọọ.
Igbo 2006
Mb͕e ọtutu ubọchi agabigaghi nwa-ya nke-nwata ahu we kporo ihe nile, je ala ọzọ di anya; n'ebe ahu ka o mefuru ihe o nwere n'idi ndu nke ila-n'iyì.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, nwokorobịa ahụ kwakọtara ihe niile o nwere gaa biri nʼotu obodo dị anya. Nʼebe ahụ, o mefuchara ihe niile o nwere nʼibi ndụ ọjọọ.