Luke 15:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Mgbe nwokorọbịa a nwere mkpebi a nꞌime onwe ya, ọ hapụrụ obodo ahụ ịlaghachikwuru nna ya. Ma mgbe ọ nọrịị ebe dị anya na-alọta, nna ya lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, nwee ọmiko nꞌahụ ya. O si nꞌụlọ ya gbapụta, gaa zute ya, bakụọ ya, kelee ya.
Igbo 2006
O we bilie, biakute nna-ya. Ma mb͕e ọ nọ n'ebe di anya ub͕u a, nna-ya huru ya, o we nwe ọmiko n'aru-ya, b͕a ọsọ, makua ya n'olu, sutu kwa ya ọnu nke-uku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, o biliri laghachikwuru nna ya. “Ma mgbe ọ nọrịị nʼebe dị anya, nna ya hụrụ ya, nwee ọmịiko nʼahụ ya, gbaara ọsọ ga makụọ ya, sutukwa ya ọnụ.