Luke 15:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ọ lọtara ụlọ, gịnị ka ọ ga-eme? Nꞌezie, asị m unu, ọ ga-akpọ ndị enyi ya na ndị agbata obi ya sị ha, ‘Bịanụ soro m ṅụrịa ọṅụ nꞌihi na achọtala m atụrụ m kpafuru akpafu.’
Igbo 2006
Mb͕e ọ biaworo n'ulo, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si ha, Sonum ṅuri ọṅu, n'ihi na achọputawom aturum furu efu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ lọtara nʼụlọ ya, ọ ga-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m atụrụ m furu efu.’