Luke 15:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe nwanyị ahụ chọtara otu mkpụrụ ego ahụ, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme? Ọ ga-akpọ ndị enyi ya na ndị agbata obi ya sị ha bịa soro ya ṅụrịa ọṅụ nꞌihi na ya achọtala otu mkpụrụ ego furu efu.
Igbo 2006
Mb͕e ọ chọputaworo ya, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si, Sonum ṅuri ọṅu, n'ihi na achọputawom shilling nke funariworom-ri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ chọtara otu mkpụrụ ego ahụ, ọ ga-akpọ ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m ego m furu efu.’