Luke 16:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Otu onye apụghị ịbụ odibo mmadụ abụọ. Ọ ghaghị ịkpọ otu asị hụ nke ọzọ nꞌanya, ma ọ bụkwanụ ọ ga-eme nanị ihe otu nꞌime ha chọrọ leda onye nke ọzọ anya. Nꞌụzọ dị otu a kwa mmadụ enweghị ike ịhụ Chineke na ego nꞌanya otu mgbe ahụ.”
Igbo 2006
Ọ dighi onye ọ bula nke nēje ozi nke puru ibu orù nke nna abua: n'ihi na ọ gākpọ otù onye nime ha asì, hu ibe-ya n'anyá; ma ọ bughi otú a ọ gējide otù, lelìa ibe-ya anya. Unu apughi ibu orù Chineke na àkù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ, sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.”