Luke 16:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Jisọs gwara ha sị, “Nꞌihu ndị mmadụ, unu na-egosi onwe unu dị ka ndị dị nsọ na ndị bụ ndị ezi omume. Ma Chineke maara obi unu. Nꞌihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị mkpa abaghị uru nꞌihu Chineke.
Igbo 2006
O we si ha, Unu onwe-unu bu ndi nāgu onwe-unu na ndi ezi omume n'anya madu; ma Chineke mara obi-unu: n'ihi na ihe di elu n'etiti madu bu ihe-árú n'anya Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị ha, “Unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume nʼihu ndị mmadụ ma Chineke maara obi unu. Nʼihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị oke mkpa bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Chineke.