Luke 16:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ma Eberaham zara ya sị, ‘Nwa m nwoke, chetakwa oge ị nọ nꞌụwa? Nꞌoge ahụ i nwetara ihe ọma nile. Chetakwa na Lazarọs natara nanị ihe ọjọọ nꞌoge ahụ. Ugbu a Chineke na-akasi Lazarọs obi ma ị nọkwa nꞌoke ihe mgbu.
Igbo 2006
Ma Abraham síri, Nwam, cheta na i nara ezi ihe-gi na ndu-gi, otù ahu Lazarọs narakwara ajọ ihe-ya: ma ub͕u a anākasi ya obi n'ebe a, ma gi onwe-gi nọ n'aru-ufu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma Ebraham sịrị ya, ‘Nwa m, chetakwa na ị nara ezi ihe gị mgbe ị dị ndụ, ebe Lazarọs nara ihe ọjọọ. Ma ugbu a, a na-akasị ya obi nʼebe a ma gị onwe gị nọkwa nʼahụhụ.