Luke 16:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Mgbe nna ya ukwu nụrụ ihe odibo ya mere, o toro ya nꞌihi na ihe o mere jupụtara nꞌamamihe. Ọ bụkwa eziokwu na ndị ụwa nwere amamihe idozi ihe ọ bụla nꞌụzọ o ga-esi baara ha uru, karịa ndị ahụ bụ ụmụ nke ìhè.
Igbo 2006
Onye-nwe-ya we to onye ahu nāchi èzí-na-ulo nke nēme ajọ omume, n'ihi na o mere dika onye nwere uche: n'ihi na umu nke oge a nwere uche n'ebe ọb͕ọ nke aka ha nọ kari umu nke ìhè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nna ya ukwu toro onyeisi ọrụ ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihi na ọ kpara agwa dị ka onye nwere uche. Nʼihi na ụmụ, nke ọgbọ a, ji akọnuche na-eso ndị ọgbọ ha karịa ụmụ nke ìhè.