Luke 17:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu ụbọchị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ọnwụnwa nke na-eduba mmadụ nꞌime mmehie ga na-adị, ma oke ahụhụ dị na-eche nwoke ahụ onye ọnwụnwa ga-esi nꞌaka ya bịara mmadụ.
Igbo 2006
O we si ndi nēso uzọ-Ya, Ọ bu ihe nāghaghi ime na ihe di ìche iche nēme ka madu ma n'ọnyà gābia: ma ahuhu gādiri onye ahu, nke ha nēsite n'aka-ya bia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Ihe ndị nke na-eme ka mmadụ jehie aghaghị ịdị, ma ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla ọnọdụ ndị a ga-esi nʼaka ya bịa.