Luke 17:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ha chọrọ ịbanye nꞌotu obodo nta, ndị ekpenta mmadụ iri zutere ha. Site nꞌebe dị anya, ha bidoro na-eti mkpu na-asị, “Jisọs, nna anyị ukwu, meere anyị ebere.”
Igbo 2006
Mb͕e Ọ nābà n'otù obodo ntà, ndikom iri, bú ndi-ekpenta, we zute Ya, ndi guzoro n'ebe di anya:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya.