Luke 17:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na dị ka mmadụ si ahụ ìhè mgbe ọ bụla amụma eluigwe gburu na mbara eluigwe site nꞌotu ebe ruo nꞌebe ọzọ, otu a ka ndị mmadụ ga-ahụ m mgbe m ga-alọghachi.
Igbo 2006
n'ihi na dika àmùmà, mb͕e ọ nēb͕u àmùmà site n'otù akuku n'okpuru elu-igwe, ọ nēnwu rue akuku ọzọ n'okpuru elu-igwe; otú a ka Nwa nke madu gādi n'ubọchi-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na Nwa nke Mmadụ nʼụbọchị ya ga-adị ka amụma nke eluigwe nke na-enye ìhè na mbara eluigwe site nʼotu ebe ruo nʼebe nke ọzọ.