Luke 17:27 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na nꞌoge Noa, ndị mmadụ nọ nꞌoriri na ọṅụṅụ. Ha na-alụkwa nwụnye na-ekenyekwa ụmụ ha di, tutuu ruo mgbe Noa banyere nꞌime ụgbọ mmiri ahụ. Chineke zitekwara mmiri dị ukwuu nke kpochapụrụ ha.
Igbo 2006
Ha nēri ihe, ha nāṅu ihe-ọṅuṅu, ha nālu nwunye, anēnye ha n'ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n'ub͕ọ-ya, oké iju-miri ahu we bia, la ha nile n'iyì.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha nọ na-eri na-aṅụ, na-alụ nwunye na-ekekwa ụmụ ha di, ruo mgbe Noa banyere nʼụgbọ mmiri. Oke iju mmiri ahụ bịakwara laa ha nʼiyi.