Luke 17:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ga-aha ka mkpụrụ mọsụtadị, unu nwere ike ịsị osisi ukwu a, ‘Site na mgbọrọgwụ fopụta onwe gị, burukwa onwe gị gaa daba nꞌosimiri,’ ọ ga-emekwa ihe unu nyere ya nꞌiwu.
Igbo 2006
Onye-nwe-ayi we si, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi osisi sycamine nka, Ka eropu gi, ku kwa gi n'oké osimiri; ọ gāṅa kwa unu nti.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onyenwe anyị zara, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ha ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị osisi ukwu a, Ka e site na mgbọrọgwụ hopu gị ma kụọkwa gị nʼime oke osimiri, ọ ga-erubere unu isi.