Luke 18:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Onye Farisii guzoro ọtọ si otu a kpee ekpere ya nye Chineke sị, ‘Chineke, biko ekelee m gị, nꞌihi na adịghị m ka ndị ọzọ. Adịghị m ka onye ọnaụtụ ahụ. Anaghị m aghọgbu mmadụ, anaghị m akwa iko, abughị m onye mmadụ na-enweghi ike ịtụkwasị obi.
Igbo 2006
Onye-Farisi guzoro nēkpe ekpere nye onwe-ya otú a, si, Chineke, ekelem Gi, na adighi m ka ndi fọduru n'etiti madu, ndi nāpunara madu ihe, ndi ajọ omume, ndi nākwa iko, ma-ọbu dika ọbuná onye-ọna-utu a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ kpee ekpere banyere onwe ya sị, ‘Chineke nna m, ana m ekele gị nʼihi na adịghị m ka mmadụ ndị ọzọ ndị na-apụnara mmadụ ihe ya nʼike, maọbụ ndị ajọ omume, maọbụ ndị na-akwa iko, ma ọ bụkwanụ dị ka onye ọna ụtụ a.