Luke 18:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ma onye ọnaụtụ guzo nꞌebe dị anya enweghị ike iweli isi ya elu lee anya nꞌeluigwe. Kama ọ nọ ebe ahụ tie aka nꞌobi na mwute gwa Chineke okwu sị, ‘Chineke m, biko meere m ebere nꞌihi na abụ m onye mmehie!’
Igbo 2006
Ma onye-ọna-utu ahu guzoro n'ebe di anya, ọ chọghi kwa iweli ọbuná anya-ya le elu-igwe, kama ọ nēti aka n'obi-ya, si, Chineke, ka obi-Gi juru n'ebe mu, bú onye-nmehie, nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma onye ọna ụtụ ahụ guzo nʼebe dị anya, o nwekwaghị ike iweli ihu ya elu lee anya nʼeluigwe. Kama, ọ na-eti aka nʼobi ya na mwute na-asị, ‘Chineke, biko mere m ebere nʼihi na abụ m onye mmehie.’