Luke 18:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
O doro m anya nke ọma na ọ bụ onye ọnaụtụ ahụ karịa onye Farisii ahụ ka Chineke gbaghaara mmehie ya mgbe o biliri ịla nꞌụlọ ya. Nꞌihi na onye ọ bụla na-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nꞌala, ma onye ọ bụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.”
Igbo 2006
Asim unu, Nwoke a ridara n'ulo-ya buru onye aguworo n'onye ezi omume kari ibe-ya: n'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ma onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Asị m unu, na nwoke a lara nʼụlọ ya bụrụ onye a gụrụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke karịa onye nke ọzọ. Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”