Luke 18:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Jisọs kpọrọ ụmụnta ahụ ka ha bịakwute ya. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha, nꞌihi na alaeze Chineke dịrị ndị dị ka ha.
Igbo 2006
Ma Jisus kpọrọ ha biakute Ya, si, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem, unu eb͕ochi-kwa-la ha: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Jisọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya, sị, “Kweenụ ka ha bịakwute m, unu egbochikwala ha, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị ka ha.