Luke 18:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Jisọs nụrụ ihe nwoke ahụ kwuru, ọ gara nwoke ahụ sị, “Ọ fọdụrụ nanị otu ihe i kwesịrị ime. Laa nꞌụlọ gị, ree ihe nile i nwere. Kesaa ego i retara nye ndị ogbenye. I mechaa nke a ị ga-enwe akụ nꞌeluigwe, bịa soro m.”
Igbo 2006
Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ya, Otù ihe fọdu-kwa-ra gi ime: re ihe nile, ka ha ra, bú nke i nwere, kenye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jisọs nụrụ nke a, ọ sịrị ya, “Otu ihe fọdụrụ ka ime: ree ihe niile i nwere, kesara ụmụ ogbenye ego ya. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, bịazie soro m.”