Luke 18:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs legidere nwoke ahụ anya mgbe o si nꞌebe ọ nọ na-apụ gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụ nnọọ ihe siri ike ime, bụ na ndị ọgaranya ga-abanye nꞌalaeze Chineke!
Igbo 2006
Ma ebe Jisus huru ya, Ọ si, Le otú ọ diri ndi nwere àkù ike ibà n'ala-eze Chineke!
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs lere ya anya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe siri ike bụ ndị ọgaranya ịba nʼalaeze Chineke.