Luke 18:29 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nꞌezie, o nweghị onye ọ bụla hapụrụ ụlọ ya ma ọ bụ nwụnye ya ma ọ bụ ụmụnne ya, ma ọ bụ ndị mụrụ ya, ma ọ bụ ụmụ ya, nꞌihi alaeze Chineke,
Igbo 2006
O we si ha, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu nwunye, ma-ọbu umu-nne, ma-ọbu ndi muru ya, ma-ọbu umu, n'ihi ala-eze Chineke,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị ha, “Nʼezie, agwa m unu, o nweghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ nwunye, maọbụ ụmụnne, maọbụ ndị mụrụ ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, nʼihi alaeze Chineke