Luke 18:31 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya gwa ha okwu sị, “Leenụ anya ugbu a, anyị na-aga Jerusalem. Nꞌebe ahụ ihe nile ndị amụma dere na ọ ga-adakwasị Onye nzọpụta ahụ ga-adakwasị m.
Igbo 2006
O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya, si ha, Le, ayi nārigoro Jerusalem, ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ site n'aka ndi-amuma gēmezu n'ebe Nwa nke madu nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ, gwa ha sị, “Anyị na-aga Jerusalem, ihe niile ndị amụma dere banyere Nwa nke Mmadụ ga-emezu.