Luke 18:34 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị okwu ndị a nile ọ gwara ha. E mere ka nkọwa okwu ndị a bụrụ ihe zoro ezo nꞌebe ha nọ. Nꞌihi ya, ha aghọtaghị okwu o kwuru.
Igbo 2006
Ma ndi ahu aghọtaghi ihe ọ bula n'ihe ndia; ezonari-kwa-ra ha okwu a, ha amaghi kwa ihe anēkwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ha aghọtaghị ihe ọbụla nʼokwu ndị a. E mere ka nkọwa okwu ndị a bụrụ ihe e zoro ezo nʼebe ha nọ, ha aghọtakwaghị ihe o kwuru.