Luke 19:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs nọ nso na Jerusalem mgbe o kwuru okwu a. Nꞌihi okwu a, ndị nụrụ ihe o kwuru chere na ọ gaghị adị anya tupuu alaeze Chineke apụta ìhè.
Igbo 2006
Ma mb͕e ha nānu ihe ndia, Ọ tukwasi tu ilu, n'ihi na Ọ nọ Jerusalem nso, na n'ihi na ha nēchè na ala-eze Chineke gaje iputa ìhè ngwa ngwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Dị ka ha na-ege ya ntị nʼokwu a, ọ gara nʼihu tụọrọ ha ilu, nʼihi na ọ nọ Jerusalem nso, ha chekwara na o ruola mgbe alaeze Chineke ga-apụta ihe.