Luke 19:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Mgbe nwoke ahụ natachara ike ịbụ eze nꞌobodo ahụ ọ gara, ọ lọghachiri nꞌobodo nke aka ya, kpọọ ndị na-ejere ya ozi o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa guzie ego o nyere ha, ịmata ego ole ha ritere nꞌuru.
Igbo 2006
O we rue, mb͕e ọ laghachiri ọzọ, mb͕e ọ natasiri ala-eze-ya, na ọ siri ka akpọ ndi-orù ahu, ndi ọ nyereri ego ahu, ka ha biakute ya, ka o we mara ihe ha zutarari n'ahia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mgbe ọ natachara ikike ịbụ eze, ọ lọghachiri, kpọọ ndị ohu ya ahụ o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa pịaziere ya ego ole ha ritere nʼuru.