Luke 19:47 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụbọchị nile Jisọs na-anọ na-akuzi ihe nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ. Kama ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị a maara aha ha dị ka ndị ndu nꞌetiti ndị Juu, nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya.
Igbo 2006
O we nēzí ihe kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke. Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi nke ndi-Ju nāchọ uzọ ila Ya n'iyì:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụbọchị niile, ọ na-anọ na-akụzi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ma ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị ndu nʼetiti ndị mmadụ, nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya.