Luke 19:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Jisọs okwu sị, “Malite taa gaa nꞌihu, ana m ekwe nkwa nꞌihu gị, onyenwe m, na aga m ekewa ihe nile m nwere ụzọ abụọ, nye ndị ogbenye otu ụzọ. Ọ bụrụkwa na o nweela ndị ọ bụla m ghọgburu nꞌụzọ ọ bụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ.”
Igbo 2006
Zakiọs we guzọ, si Onye-nwe-ayi, Le, Onye-nwe-ayi, nkera ihe m'nwere ka m'gēnye ndi-ob͕eye; ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n'ebubo ugha, m'gēnyeghachi anọ anọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Onyenwe anyị, “Lee, Onyenwe anyị, aga m enye ndị ogbenye ọkara ihe niile m nwere. Ọ bụrụkwa na o nwere onye m ghọgburu nara ya ihe ọbụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ.”