Luke 2:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌụbọchị nke asatọ ya, mgbe oge ruru ibi nwanta ahụ ugwu, ha gụkwara ya aha. Aha ha nyere ya bụ Jisọs, aha ahụ mmụọ ozi sị na a ga-akpọ ya tupuu Meri adịrị ime.
Igbo 2006
Mb͕e ubọchi asatọ zuru ibì Ya úgwù, ewe kpọ aha-Ya Jisus, nke mọ-ozi kpọrọ ya mb͕e akātughi ime Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, mgbe oge ruru ibi nwata ahụ ugwu, ha gụkwara ya aha. Aha ha nyere ya bụ Jisọs, aha ahụ mmụọ ozi nyere tupu a dị ime ya.