Luke 2:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe oge ruru inye onyinye nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem, Meri na Josef na nwa ọhụrụ ahụ gara Jerusalem. Meri gara inye onyinye maka ịdị ọcha dị ka e nyere nꞌiwu Mosisi na nwanyị ọ bụla mụrụ nwa ọhụrụ ga-enye, na ikuputa nwa ọhụrụ ahụ nꞌihu Chineke.
Igbo 2006
Mb͕e ubọchi nile nke ime ha ka ha di ọcha dika iwu nke Moses si di zuru, ha we kuru Ya rigoro Jerusalem, iche Ya n'iru Onye-nwe-ayi
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe oge zuru maka mmemme nke ịdị ọcha dị ka iwu Mosis siri dị, ha kutere ya na Jerusalem iche ya nʼihu Onyenwe anyị