Luke 2:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌoge ahụ kwa, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Simiọn bụ ezi mmadụ, bụrụkwa onye ji obi ya nile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya ịhụ mgbe Chineke ga-azọpụta ndị Izirel.
Igbo 2006
Ma le, otù nwoke nọ na Jerusalem, onye aha-ya bu Simeon; nwoke a bu kwa onye ezi omume na onye nātu egwu Chineke, nēche nkasi-obi nke Israel: Mọ Nsọ di kwa n'aru ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma lee, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ bụ onye ezi omume bụrụkwa onye ji obi ya niile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya maka nkasiobi nke ndị Izrel.