Luke 2:27 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌụbọchị ahụ Meri na Josef kuuru Jisọs bịa nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ, imere ya ihe iwu kwuru, Mmụọ Nsọ kwalikwara Simiọn, mee ya ka ọ bịa nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ.
Igbo 2006
O we bia na Mọ ahu nime ulo uku Chineke: mb͕e ndi muru Ya kubatara Nwatakiri ahu, bú Jisus, ka ha we mere Ya dika omume iwu Chineke si di,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Site nʼodudu nke Mmụọ Nsọ, ọ batara nʼụlọnsọ ukwu, ma mgbe nne na nna nwata ahụ bụ Jisọs kubatara ya dị ka omenaala iwu si dị,