Luke 2:34 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Emesịa, Simiọn gọziri ha, tụgharịa gwa Meri okwu sị ya, “Ị hụrụ nwanta a? Ọ bụ onye Chineke họpụtara ịbụ ụzọ nzọpụta na ịla nꞌiyi nye ọtụtụ ndị Izirel. Nꞌihi na ụdị ụzọ e si enwe ndụ ọhụrụ nke ọ ga-egosi ndị mmadụ, bụ ụzọ nke ọtụtụ mmadụ ga-ekwukwa okwu megide.
Igbo 2006
Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Simiọn gọziri ha, sịkwa Meri nne ya, Lee, “Nwatakịrị a bụ onye e zitere ka ọ bụrụ ọdịda na mbili nye ọtụtụ mmadụ nʼIzrel, ọ ga-abụkwa ihe ama nke ọtụtụ ga-ekwujọ.