Luke 2:35 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụkwa site nꞌụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche zoro ezo nke ọtụtụ mmadụ, mee ka ọ pụta ìhè. Obibi ndụ ya ga-ewetakwara gị, bụ nne ya, iru uju. Iru uju gị ga-adị ukwuu dị ka a ga-asị na e ji mma ihu abụọ dụwaa gị mkpụrụ obi.”
Igbo 2006
ma mma-agha gāduwa kwa nkpuru-obi gi onwe-gi; ka ewe kpughe èchìchè nke si n'ọtutu obi puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụkwa site nʼụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche nke dị ọtụtụ nʼobi. Mma agha ga-adụwakwa mkpụrụobi nke gị onwe gị.”