Luke 2:36 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
O nwekwara otu agadi nwanyị ọzọ nọ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ nꞌụbọchị ahụ. Aha ya bụ Ana. Ọ bụ onye amụma, bụrụkwa nwa Fanuel nke si nꞌebo Asha. Ana enweghị di, nꞌihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri nanị afọ asaa. Site na mgbe di ya nwụrụ ruo ụbọchị ahụ ọ bịara ụlọ nsọ ukwu Chineke, iri afọ asatọ na anọ agafeela. Oge ndị a nile, Ana jiri ụlọ nsọ ukwu ahụ mere ebe obibi ya. Ebe a ka ọ nọ na-efe Chineke ehihie na abalị, ọ nọkwa na-ekpe ekpere na-ebukwa ọnụ.
Igbo 2006
Otù onye anākpọ Ana di kwa, bú onye-amuma-nwanyi, nwa-nwanyi Fanuel, nke si n'ebo Asha puta (nwanyi a aghọwo ezi agadi, ebe ya na di-ya biri arọ asa site na nwa-ab͕ọghọ-ya,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O nwekwara onye amụma nwanyị, aha ya bụ Ana, ada Fanuel nke si nʼebo Asha. Ọ bụ ezigbo agadi nwanyị na-enweghị di, nʼihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri naanị afọ asaa.