Luke 2:43 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe e mesịrị mmemme ahụ, ndị mụrụ ya malitere ịlaghachi azụ nꞌobodo nke aka ha, ma Jisọs nọdụrụ na Jerusalem. Kama ndị mụrụ ya amaghị na o soghị ha na-alọta.
Igbo 2006
mb͕e ha nọzuru ubọchi nile, mb͕e ha nālaghachi, Nwa-okoro ahu, bú Jisus, we nọdu n'azu na Jerusalem; ndi muru Ya amaghi kwa ya;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe e mesịrị mmemme ahụ, ka ndị mụrụ ya na-alaghachi, nwata ahụ bụ Jisọs nọdụrụ na Jerusalem. Ndị ha amataghị na o soghị ha na-alọta.