Luke 2:51 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Emesịa, Jisọs sooro ha laa Nazaret. O rubeere ha isi, meekwara ha ihe nile ha chọrọ ka o mee. Ma nne ya debere ihe ndị a nile nꞌobi ya.
Igbo 2006
O we so ha rida, bia rue Nazaret; Ọ we nọdu n'okpuru ha: nne-Ya we nēdebe ihe nile ekwuru n'obi-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, o sooro ha laghachi Nazaret ma na-erubekwara ha isi. Ma nne ya dobere ihe ndị a niile nʼobi ya.