Luke 2:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ mụpụtakwara nwa mbụ ya, nwa nwoke. O ji akwa kee ya, nyibe ya nꞌụlọ a na-edebe anụ ụlọ, nꞌihi na ha enwetaghị ebe ndina nꞌụlọ ndị ije dị nꞌobodo Betilehem.
Igbo 2006
O we muta Nwa-nwoke mbu ya; o we ke Ya n'ákwà ọkiké, nyibe Ya n'ihe anētiye nri anu-ulo, n'ihi na uzọ adighi nye ha n'ulo ndi-ije.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ mụrụ nwa nwoke mbụ ya. O ji akwa kee ya, nibe ya nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri, nʼihi na ha enwetaghị ebe ndina nʼụlọ ndị ije.